39 Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Naftali dika ab͕uru nile ha si di, obodo nile na obodo ntà ha.
40 Ọ bu ebo umu Dan dika ab͕uru nile ha si di ka ife-nzà nke-asa putara.
41 Ókè-ala ihe-nketa-ha we buru Zọra, na Eshtaol, na Ia-shemesh;
42 na Shaalabin na Ajalon, na Itla;
43 na Ilon, na Timna, na Ekron;
44 na Elteke, na Gibeton, na Bealat;
45 na Jihud, na Bene-berak, na Gat-rimon;