42 na Shaalabin na Ajalon, na Itla;
43 na Ilon, na Timna, na Ekron;
44 na Elteke, na Gibeton, na Bealat;
45 na Jihud, na Bene-berak, na Gat-rimon;
46 na Me-jakon, na Rakon, tiyere ókè-ala di na ncherita-iru Jafo.
47 Ókè-ala umu Dan we si n'ebe ha nọ pua: umu Dan we rigo, buso Leshem agha, were ya, were ọnu mma-agha tib͕ue ya, ha we nweta ya, biri nime ya, we kpọ Leshem, Dan, dika aha Dan, bú nna-ha, si di.
48 Nka bu ihe-nketa ebo umu Dan dika ab͕uru nile ha si di, obodo ndia na obodo ntà ha.