19 Ọ gēru kwa, na onye ọ bula nke gēsi n'ọnu-uzọ ulo-gi pua n'èzi, ọbara-ya gādikwasi n'isi-ya, ayi onwe-ayi gābu kwa ndi ikpe nāmagh: ma onye ọ bula gi na ya gānọ n'ulo, ọbara-ya gādikwasi n'isi-ayi, ma ọ buru na aka ọ bula adikwasi ya.
20 Ma ọ buru na i gosi okwu-ayi nka, ayi gābu kwa ndi ikpe nāmaghi n'iyi-gi nke i meworo ka ayi ṅua.
21 O we si, Dika okwu nile unu si di, otú a ka ọ gādi. O we zilaga ha, ha we je: o we kegide eriri uhie ahu nime window.
22 Ha we je, biarue ugwu ahu, nọdu n'ebe ahu ubọchi atọ, rue mb͕e ndi nāchu ha laghachiri: ndi nāchu ha we chọ ha n'uzọ ahu nile, ma ha achọtaghi ha.
23 Ndikom abua ahu we laghachi, si n'ugwu ahu rida, we gabiga, biakute Joshua nwa Nun; ha we kọrọ ya ihe nile nke dakwasiri ha.
24 Ha we si Joshua, N'ezie Jehova enyewo ala ahu nile n'aka-ayi; ọzọ kwa, ndi nile ndi bi n'ala ahu nāb͕azepu n'iru ayi.