26 Obodo nile di iri, ha na ebe-ita-nri-ha, bú nke diri ab͕uru umu Kohat fọduru.
27 Ha nye-kwa-ra umu Giashon, ndi sitere n'ab͕uru ndi Livai, Golan nime Beshan na ebe-ita-nri-ya nile, bú obodo nb͕abà nke ob͕u-madu; na Be-eshtera na ebe-ita-nri-ya nile, site na nkera ebo Manase; obodo abua.
28 Site kwa n'ebo Isaka, Kishion na ebe-ita-nri-ya nile, na Daberat na ebe-ita-nri-ya nile;
29 na Jamut na ebe-ita-nri-ya nile, na En-ganim na ebe-ita-nri-ya nile, obodo anọ.
30 Site kwa n'ebo Asha, Mishal na ebe-ita-nri-ya nile, na Abdon na ebe-ita-nri-ya nile;
31 na Helkat na ebe-ita-nri-ya nile, na Rehob na ebe-ita-nri-ya nile; obodo anọ.
32 Site kwa n'ebo Naftali, Kedesh nime Galili na ebe-ita-nri-ya nile, bú obodo nb͕abà nke ob͕u-madu, na Hamot-doa na ebe-ita-nri-ya nile, na Katan na ebe-ita-nri-ya nile; obodo atọ.