1 Joshua we chikọta ebo nile nke Israel rue Shekem, ọ kpọ ndi-okenye Israel, na ndi-isi-ha, na ndi-ikpé-ha, na ndi-odozi-okwu-ha; ha we guzo onwe-ha n'iru Chineke.
2 Joshua we si ndi Israel nile, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, N'ofè Osimiri ahu ka nna-unu-hà biri site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, bú Tira, nna Abraham, na nna Nehoa: ha we fè chi ọzọ di iche iche.
3 M'we si n'ofè Osimiri ahu kuru nna-unu, bú Abraham, me ka ọ nēje ije n'ala Kenean nile, M'we me ka nkpuru-ya ba uba, M'we nye ya Aisak.
4 M'we nye Aisak Jekob na Isọ: M'we nye Isọ ugwu Sia, ka ọ nweta ya; ma Jekob na umu-ya ridara n'Ijipt.
5 M'we ziga Moses na Eron, tie Ijipt ihe, dika ihe ahu si di nke M'mere n'etiti ya: emesia M'we me ka unu puta.
6 M'we me ka nna-unu-hà si n'Ijipt puta: unu we biarue oké osimiri; ndi Ijipt we chiri ub͕ọ-ala na ndi-inyinya chua nna-unu-hà n'azu rue Oké Osimiri Uhie.