18 Jehova we chupu ndi ahu nile n'iru ayi, bú ndi-Amorait ndi bi n'ala nka: ayi onwe-ayi gēfè kwa Jehova òfùfè; n'ihi na Ya onwe-ya bu Chineke-ayi.
19 Joshua we si ndi Israel, Unu apughi ifè Jehova òfùfè; n'ihi na Chineke di nsọ ka Ọ bu; Chineke ekworo ka Ọ bu; Ọ gaghi-ab͕aghara njehie-unu na nmehie nile unu.
20 Mb͕e unu gārapu Jehova, fè chi ala ọzọ òfùfè, Ọ gēchighari kwa mejọ unu, me ka unu gwusia, mb͕e O mesiri unu nma.
21 Ndi Israel we si Joshua, É-è; kama Jehova ka ayi gēfè òfùfè.
22 Joshua we si ndi Israel, Ndi-àmà megide onwe-unu ka unu bu, na unu onwe-unu arọputaworo onwe-unu Jehova, ifè Ya òfùfè. Ha we si, Ndi-àmà ka ayi bu.
23 Ọ si, Ma ub͕u a, wezuganu chi ala ọzọ nile nke di n'etiti unu, do-kwa-ra Jehova, bú Chineke Israel, obi-unu.
24 Ndi Israel we si Joshua, Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi gēfè òfùfè, olu-Ya ka ayi gēge kwa nti.