1 Joshua we bilie n'isi-ututu, ha we si na Shitim bilie ije, we biarue Jọdan, ya onwe-ya na umu Israel nile; ha we nọ ọnọdu-abali n'ebe ahu tutu ha agabiga.
2 O rue, n'ọgwugwu ubọchi atọ, na ndi-ọchi-agha gabigara n'etiti ọmuma-ulo-ikwū;
3 ha we nye ndi Israel iwu, si, Mb͕e unu nāhu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, bú Chineke-unu, na ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, ka ha nēbu ya, unu onwe-unu gēsi kwa n'ebe unu nọ bulie ije, we nējeso ya.
4 Nání, ókè gādi n'etiti unu na ya, dika nnù cubit ise n'ọtùtù: unu abiarula nso ya, ka unu we mara uzọ nke unu gēsi je; n'ihi na unu agabigaghi n'uzọ a na mb͕e gara aga.