19 Ndi Israel we si na Jọdan rigota n'ubọchi nke-iri nke ọnwa mbu, má ulo-ikwū-ha na Gilgal, na nsọtu ọwuwa-anyanwu Jeriko.
20 Nkume iri na abua ahu, nke ha si na Jọdan were, Joshua we guzo ha na Gilgal.
21 Ọ we gwa umu Israel okwu, si, Mb͕e umu-unu gāju ndi bu nna-ha ajuju n'ọdi-n'iru, si, Gini bi isi nkume ndia?
22 Unu gēme kwa ka umu-unu mara, si, N'ala-akọrọ ka Israel gabigara Jọdan nka.
23 N'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, mere ka miri Jọdan takọrọ n'iru unu, rue mb͕e unu gabigara, dika Jehova, bú Chineke-unu, mere Oké Osimiri Uhie, nke O mere ka ọ takọrọ n'iru ayi, rue mb͕e ayi gabigara:
24 ka ndi nile nke uwa we mara aka Jehova, na ike ka ọ di; ka ha we tua egwu Jehova, bú Chineke-unu, ubọchi nile.