15 Ọ gēru kwa, na onye anwudere ya na ihe ahu ewezugara nye Jehova, agēsure ya n'ọku, ya onwe-ya na ihe nile o nwere: n'ihi na ọ gabigawo ọb͕ub͕a-ndu Jehova, na n'ihi na o mewo ihe-nzuzu n'Israel.
16 Joshua we bilie n'isi-ututu, me ka Israel biarue nso n'ebo nile ha; ewe nwude ebo Juda:
17 o we me ka ab͕uru Juda biarue nso; ọ we nwude ab͕uru ndi Zera: o we me ka ab͕uru ndi Zera biarue nso na ndikom-ya; ewe nwude Zabdi:
18 o we me ka ulo-ya biarue nso na ndikom-ya; ewe nwude Ekan, nwa Kami, nwa Zabdi, nwa Zera, nke ebo Juda.
19 Joshua we si Ekan, Nwam, biko, nye Jehova, bú Chineke Israel, nsọpuru, nye kwa Ya ekele; biko, gosikwam ihe i meworo; ezopula ya n'ebe m'nọ.
20 Ekan we za Joshua, si, N'ezi-okwu mu onwem emehiewo megide Jehova, bú Chineke Israel, otú a na otú a ka m'mewo-kwa-ra:
21 m'we hu n'etiti ihe-nkwata otù ezi uwe-nwuda nke Shaina, na ọgu shekel ọla-ọcha iri, na otù nkpirikpi ọla-edo nke ọtùtù-ya di ọgu shekel abua na iri, m'we nwe anya-uku n'ebe ha di, m'we chiri ha; ma, le, ezoworo ha n'ala n'etiti ulo-ikwūm, ọla-ọcha ahu di kwa n'okpuru ya.