19 Ndi nēru nbì we si n'ọnọdu-ha bilie ngwa ngwa, we b͕a ọsọ mb͕e o setiri aka-ya, ha we ba n'obodo, were ya; ha we me ngwa sue obodo ahu ọku.
20 Ndikom Ai we le anya n'azu ha, hu, ma, le, anwuru-ọku obodo-ha rigoro rue elu-igwe, ike adighi kwa nime ha ib͕alaga otù uzọ ọzọ: ndi Israel ndi nāb͕alaga n'ọzara we chigharia imegide ndi nāchu ha.
21 Joshua na Israel nile-hukwara na ndi nēru nbì ewerewo obodo ahu, hu kwa na anwuru-ọku obodo arigowo n'elu, ha we laghachi, tib͕ue ndikom Ai.
22 Ndi nēru nbì si kwa n'obodo puta izute ha; ha we nọ n'etiti Israel, ndi si n'ọzara nọ n'otù akuku, ndi si n'obodo nọ kwa n'akuku ọzọ: ha we tib͕ue ha rue mb͕e ọ dighi onye fọduru ma-ọbu onye b͕apuru ab͕apu arapuru ha.
23 Ha we were eze Ai na ndu, me ka ọ biarue Joshua nso.
24 O rue, mb͕e Israel b͕usiri ndi nile bi na Ai n'ọhia, bú n'ọzara ebe ha churu ha, mb͕e ha nile dasiri n'ọnu mma-agha, rue mb͕e ha gwusiri, na Israel nile laghachiri na Ai, ọnu mma-agha tib͕ue ya.
25 Ndi nile ndi dara n'ubọchi ahu, ma nwoke ma nwayi, we di orú nnù madu na nnù iri, bú ndikom nile nke Ai.