31 dika Moses, bú orù Jehova, nyere umu Israel iwu, dika edeworo ya n'akwukwọ iwu Moses, bú ebe-ichu-àjà nkume zuru okè, nke ọ nēmeghi ka ígwè ga n'elu ha: ha we surere Jehova àjà-nsure-ọku n'elu ya, chu kwa àjà-udo.
32 O we dekwasi na nkume ahu n'ebe ahu ndeputa iwu Moses, nke o dere n'akwukwọ n'iru umu Israel.
33 Israel nile, na ndi-okenye-ha, na ndi-ọchi-agha-ha, na ndi-ikpé-ha, nēguzo kwa n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ nke ib͕e ahu na ncherita-iru ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, ma ọbìa ma onye amuru n'ala; nkera-ha na ncherita-iru ugwu Geraizim, nkera-ha ọzọ na ncherita-iru ugwu Ibal; dika Moses, bú orù Jehova, nyere iwu na mbu, igọzi ndi Israel.
34 Emesia o we gua okwu nile nke iwu ahu, ma ngọzi ma nkọcha, dika ihe nile si di nke edeworo n'akwukwọ iwu ahu.
35 Ọ dighi okwu ọ bula n'ihe nile nke Moses nyere n'iwu nke Joshua nāgughi n'iru nkpọkọta nile nke Israel, na ndinyom, na umu-ntakiri, na ndi-ọbìa ndi nēje ije n'etiti ha.