8 Ha we si Joshua, Ndi-orù-gi ka ayi bu. Joshua we si ha, Òle ndi ka unu bu? òle ebe unu si bia kwa?
9 Ha we si ya, Ala di anya nke-uku ka ndi-orù-gi si bia n'ihi aha Jehova, bú Chineke-gi: n'ihi na ayi anuwo akukọ- Ya, na ihe nile O mere n'Ijipt,
10 na ihe nile O mere eze abua nke ndi-Amorait, ndi biri n'ofè Jọdan, bú nke O mere Saihon, bú eze Heshbon, me kwa Og, bú eze Beshan, nke nọ n'Ashtarot.
11 Ndi-okenye-ayi na ndi nile bi n'ala-ayi we gwa ayi okwu, si, Werenu ihe unu gēri n'uzọ n'aka-unu, je izute ha, si ha, Ndi-orù-unu ka ayi bu: ma ub͕u a, ka ayi na unu b͕a ndu.
12 Achicha-ayi a, mb͕e ọ di ọku ka ayi weputara ya n'ulo-ayi ibu ihe ayi gēri n'uzọ n'ubọchi ayi putara ijekuru unu; ma ub͕u a, le, ọ kpọwo nku, ma kwa ebu:
13 karama-akpukpọ manya-vine ndia, nke ayi b͕ajuru, di kwa ọhu; ma, le, ha dọwara adọwa: uwe-ayi na akpukpọ-ukwu-ayi ndi a akawo kwa nká site n'ije di ogologo nke-uku.
14 Ndikom ahu we nara ufọdu nime ihe-oriri-uzọ-ha, ha ajughi kwa ase n'ọnu Jehova.