4 Ọ nābasiri oké osimiri nba ike, me ka ọ ta, ọ bu kwa osimiri nile ka O meworo ka ha takọrọ: Beshan nātalata, ya na Kamel, ihe-opupú nke Lebanon nātalata kwa.
5 Ugwu nile emewo nkpatu site na Ya, ugwu ntà nile ab͕azewo kwa; ala we bulie onwe-ya site n'iru Ya, e, elu-uwa dum madu bi na ndi nile bi nime ya.
6 Ònye gēguzo n'iru oké iwe-Ya? ọ̀ bu kwa onye gēguzosi ike n'idi-ọku nke iwe-Ya? awusiwo ọnuma-Ya dika ọku, akwatuwo kwa oké nkume nile site na Ya.
7 Jehova di nma, Ọ bu ebe ewusiri ike n'ubọchi ahuhu; Ọ bu kwa onye nāma ndi nāgbabà nime Ya.
8 Ma Ọ gēji miri nke nērubiga ókè nke nērubiga erubiga me ka ọnọdu obodo ahu gwusia, ọ bu kwa ndi-iro-Ya ka Ọ gāchubà n'ọchichiri.
9 Gini ka unu nēchè megide Jehova? Ya onwe-ya nēme ka ọ gwusia: nkpab͕u agaghi-ebili nke ub͕ò abua.
10 N'ihi na ọ bu ezie na ha di ka ogwu tuhiri atuhi, buru kwa ndi ṅubigaworo manya ókè dika n'iṅubiga-manya-ókè-ha, ọku gēripia ha dika ahihia-ọka kpọnwusiri akpọnwu.