6 Ònye gēguzo n'iru oké iwe-Ya? ọ̀ bu kwa onye gēguzosi ike n'idi-ọku nke iwe-Ya? awusiwo ọnuma-Ya dika ọku, akwatuwo kwa oké nkume nile site na Ya.
7 Jehova di nma, Ọ bu ebe ewusiri ike n'ubọchi ahuhu; Ọ bu kwa onye nāma ndi nāgbabà nime Ya.
8 Ma Ọ gēji miri nke nērubiga ókè nke nērubiga erubiga me ka ọnọdu obodo ahu gwusia, ọ bu kwa ndi-iro-Ya ka Ọ gāchubà n'ọchichiri.
9 Gini ka unu nēchè megide Jehova? Ya onwe-ya nēme ka ọ gwusia: nkpab͕u agaghi-ebili nke ub͕ò abua.
10 N'ihi na ọ bu ezie na ha di ka ogwu tuhiri atuhi, buru kwa ndi ṅubigaworo manya ókè dika n'iṅubiga-manya-ókè-ha, ọku gēripia ha dika ahihia-ọka kpọnwusiri akpọnwu.
11 Nime gi ka otù onye siri puta, nke nēchè ihe ọjọ megide Jehova, nādu kwa ọdu ihe jọb͕uru onwe-ya.
12 Otú a ka Jehova siri: Ọ bu ezie na ha zuru okè, ba kwa uba otú a, ọbuná otú a ka agēb͕utu ha, ọ gāgabiga kwa. Ọ bu ezie na ewedawom i n'ala, ma M'agaghi-eweda kwa gi n'ala ọzọ.