5 Ọ buru na ndi-ori abiakute gi, ọ buru na ndi nāpunara madu ihe abia n'abali, (le otú alaworo gi n'iyì nke-uku!) hà agaghi-ezu ihe gēzuru ha n'ori? ọ buru na ndi nāghọrọ nkpuru-vine abiakute gi, hà agaghi-aghọfọ nkpuru nke fọduru itutukọ?
6 Le otú achọputaworo ihe Isọ nke-uku! le otú anubigaworo ọku ókè n'obi inwe àkù-ya ezobere!
7 Rue ókè-ala ka ndi nile gi na ha nọ n'ọb͕ub͕a-ndu zipuworo gi: ndi gi na ha nọ n'udo arafuwo gi, nwe ike imegide gi; nri-gi ka ha nēme ka ọ buru ọnyà n'okpuru gi: ọ dighi nghọta di nime ya.
8 Ọ̀ bughi n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ka M'gēme ka ndi-amam-ihe la n'iyì pua n'Edom, me kwa ka nghọta la n'iyì pua n'ugwu Isọ?
9 Gi Timan, ndi-dike-gi gātu ujọ, ka ewe bipu onye ọ bula n'ugwu Isọ site n'ob͕ub͕u.
10 N'ihi ihe-ike emere nwa-nne-gi, bú Jekob, ka ihere gēkpuchi gi, agēbipu kwa gi rue mb͕e ebighi-ebi.
11 N'ubọchi i guzoro iche na ncherita-iru, n'ubọchi ndi ala ọzọ dọtara usu-ndi-agha-ya n'agha, mb͕e ndi mba ọzọ bata-kwa-ra n'ọnu-uzọ-ama-ya nile, fekwasi Jerusalem nzà, ọbuná gi onwe-gi nọ ka otù nime ha.