1 O rue, na mb͕e ndi-ikpe n=ekpe, na ok/e unwu di n>ala. Ot#u nwoke nke Bet-lehem-juda we je inọ dika ọb#ia n>ala-ọhia Moab, ya onwe-ya, na nwunye-ya, na umu-ya ndikom abua.
2 Aha nwoke ahu bu Elimelek, aha nwunye-ya bu Naomi, aha umu-ya ndikom abua bu Mahlon na Kilion, ndi Efrat nke Bet-lehem-juda. Ha we ba n>ala-ọhia Moab, nọ n>ebe ahu.
3 Elimelek, b/u di Naomi, we nwua; ma nwayi ahu na umu-ya ndikom abua fọduru.
4 Ha we lutara onwe-ha nwunye sitere n>umu-ndinyom Moab; aha ot#u bu _Opa, aha nke-ọzọ bu Rut: ha we biri n>ebe ahu ihe ra ka arọ iri.