5 Mahlon na Kilion we nwu kwa, ha abua; o we fọdu n/an/i nwayi ahu site n>umu-ya abua site kwa na di-ya.
6 O we bilie, ya onwe-ya na nwunye abua nke umu-ya, ka o we si n>ala-ọhia Moab lata: n>ihi na ọ nuru n>ala-ọhia Moab na Jehova eletawo ndi-ya n>inye ha nri.
7 O we si n>ebe ọ nọ pua, ya na nwunye abua nke umu-ya; ha we je n>uzọ ilata n>ala Juda.
8 Naomi we si nwunye abua nke umu-ya, Jenu, laghachi, nwayi ọ bula n>ulo nne-ya: Jehova mere unu ebere, dika unu mere ndi nwuru anwu, me-kwa-ra mu onwem.
9 Jehova me ka unu chọta izu-ike, nwayi ọ bula n>ulo di-ya. O we sutu ha ọnu; ha we welie olu-ha kwa /akw/a.
10 Ha we si ya, N>ezie ayi g=esoro gi laghachikuru ndi-gi.
11 Naomi we si, Laghachinu, umum: n>#ihi gini ka unu g=esom la? #enwerem umu-ndikom ọzọ n>afọm, ka ha we buru unu di?