3 Sa kwa aru-gi, te manu n>aru gi, b͕okwasi uwe-nb͕okwasi-gi nile n>aru gi, ridarue ebe-nzọcha-ọka: emela ka nwoke ahu mara gi, rue mb͕e o risiri ihe, @nusi kwa ihe-ọ@nu@nu.
4 O g=eru kwa, mb͕e o dinara ala, na i g=amara ebe o n=edina, i g=ab#a kwa, kpughepu ukwu-ala-ya abua, dina ala; ya onwe-ya g=egosi kwa gi ihe i g=eme.
5 O we si ya, Ihe nile i sirim, m>g=eme ya.
6 O we ridarue ebe-nzọcha-ọka, me dika ihe nile si di nke nne di-ya nyere ya n>iwu.
7 Boaz we rie ihe, @nu kwa ihe-ọ@nu@nu, obi-ya we di nma, o we ba idina ala na nsọtu obo ọka: Rut we ba nwayọ, kpughepu ukwu-ala-ya abua, dina ala.
8 O rue, n>etiti abali, na nwoke ahu mara jijiji, we chigharia: ma, le, ot#u nwayi n=edina n>ukwu-ala-ya.
9 O we si, Onye ka i bu? _O si, Mu onwem bu Rut, or#u-gi nwayi: b͕asa kwa ọnu-ọnu uwe-nwuda-gi n>aru or#u-gi nwayi; n>ihi na onye-nb͕aputa ka i bu.