10 Nime nka ka ihu-n'anya di, ọ bughi na ayi onwe-ayi huru Chineke n'anya, kama ọ bu na Ya onwe-ya huru ayi n'anya, we zite Ọkpara-Ya ka Ọ buru ihe ijuru Ya obi bayere nmehie-ayi.
11 Ndi m'huru n'anya, ọ buru na Chineke huru ayi n'anya otú a, ayi onwe-ayi ji kwa ugwọ ihurita onwe-ayi n'anya.
12 Ọ dighi onye ọ bula huworo Chineke mb͕e ọ bula: ọ buru na ayi ahurita onwe-ayi n'anya, Chineke nānọgide nime ayi, emewo kwa ka ihu-n'anya-Ya zue okè nime ayi:
13 nime nka ka ayi mara na ayi nānọgide nime Ya, na Ya onwe-ya nānọgide kwa nime ayi, n'ihi na O nyewo ayi ufọdu nime Mọ nke Ya.
14 Ayi onwe-ayi ahuwo kwa, ayi nāb͕a kwa àmà, na Nna-ayi ezitewo Ọkpara-Ya ka Ọ buru Onye-nzọputa nke uwa.
15 Onye ọ bula nke gēkwuputa na Jisus bu Ọkpara Chineke, Chineke nānọgide nime ya, ya onwe-ya nānọgide kwa nime Chineke.
16 Ayi onwe-ayi amawo kwa ihu-n'anya ahu, ayi ekwerewo kwa na ya, bú nke Chineke nwere n'ebe ayi nọ. Chineke bu ihu-n'anya; onye nānọgide kwa n'ihu-n'anya; nime Chineke ka ọ nanọgide Chineke nānọgide kwa nime ya.