3 N'ihi na nka bu ihu-n'anya Chineke, ka ayi debe ihe nile O nyere n'iwu: ihe O nyere n'iwu adighi kwa arọ́.
4 N'ihi na ihe ọ bula nke amuworo site na Chineke nēmeri uwa: nka bu kwa nmeri nke meriworo uwa, bú okwukwe-ayi.
5 Ma ònye bu onye nēmeri uwa, ma-ọbughi onye ahu nke kwere na Jisus bu Ọkpara Chineke?
6 Nka bu Onye ahu Nke were miri na ọbara bia, bú Jisus Kraist; ọ bughi nání nime miri ahu, kama ọ bu nime miri ahu na nime ọbara ahu.
7 Ọ bu kwa Mọ Nsọ bu Onye nāb͕a àmà, n'ihi na Mọ ahu bu ezi-okwu.
8 N'ihi na ndi ahu ndi nāb͕a àmà di atọ, bú Mọ ahu, na miri ahu, na ọbara ahu: ha atọ diri ime otù ihe ahu.
9 Ọ buru na ayi anata àmà nke madu, àmà nke Chineke ka ya uku: n'ihi na àmà nke Chineke bu nka, na Ọ b͕awo àmà bayere Ọkpara-Ya.