1 Ma ọ dighi unu nkpà, umu-nna-ayi, ka edegara unu akwukwọ bayere oge ahu nile na ubọchi ahu nile.
2 N'ihi na unu onwe-unu matara nke-ọma na dika onye-ori nābia n'abali, otú a ka ubọchi nke Onye-nwe-ayi nābia.
3 Mb͕e ha nāsi, Udo na ntukwasi-obi di, mb͕e ahu na mberede ka nbili nābiakwasi ha, dika ime nēme nwanyi nke di ime; ha agaghi-ab͕anari kwa ya ma-ọli.
4 Ma unu onwe-unu, umu-nna-ayi, anọghi n'ọchichiri, ka ubọchi ahu we jide unu na mberede dika onye-ori:
5 n'ihi na unu onwe-unu nile bu umu nke ìhè, na umu nke ehihie: ayi abughi ndi nke abali, ma-ọbu nke ọchichiri;