19 kama eji ọbara di oké ọnu-ahia, dika nke nwa-aturu nke ọlu ma-ọbu ntupọ nādighi ya n'aru, bú ọbara nke Kraist:
20 Onye eburu uzọ mara n'ezie mb͕e akātọghi ntọ-ala nke uwa, ma emere ka Ọ puta ìhè n'ọgwugwu oge ndia n'ihi unu,
21 ndi sitere n'aka-Ya buru ndi kwere na Chineke, Onye mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, we nye Ya ebube; ka okwukwe-unu na olile-anya-unu we di n'ebe Chineke nọ.
22 Ebe unu meworo nkpuru-obi-unu ka ha di ọcha n'iṅa-nti nke unu ṅara ezi-okwu, iwere ihu-n'anya nke iru-abua nādighi ya hu umu-nna-unu n'anya, sitenu n'obi-unu hurita onwe-unu n'anya si-ike:
23 ebe amuworo unu ọzọ, esiteghi na nkpuru apuru imebi, kama esitere na nke anāpughi imebi, site n'okwu Chineke, nke di ndu, nke nādigide kwa, mu unu ọzọ.
24 N'ihi na,Anu-aru nile di ka ahihia,Ebube-ya nile di kwa ka uzari ahihia.Ahihia akpọnwuwo, uzari-ya adapuwo kwa:
25 Ma okwu Onye-nwe-ayi nādigide rue mb͕e ebighi-ebi.Nka bu kwa okwu nke ozi ọma ahu ezisara unu.