8 Onye unu huru n'anya, ọ bu ezie na unu ahughi Ya anya; Onye unu kwere na Ya, ọ bu ezie na unu adighi-ahu Ya anya ub͕u a, obi we nātọ unu utọ nke-uku n'ọṅù nke anāpughi ikwu okwu nke enyewo-kwa-ra ya otuto:
9 ebe unu nānata ihe okwukwe-unu gēweta, bú nzọputa nke nkpuru-obi-unu.
10 Ọ bu kwa nzọputa nka ka ndi-amuma chọrọ, nyocha kwa ihe bayere ya, bú ndi buru amuma bayere amara ahu nke gēru unu:
11 nēnyocha oge ọ bu ma-ọbu aha oge ọ bu, bú nke Mọ nke Kraist Nke si nime ha nēgosi, mb͕e O buru uzọ nāb͕a àmà bayere ahuhu nke Kraist, na ebube nile nke gēso ha.
12 Ndi ekpughere nye, na ọ bughi onwe-ha, kama ọ bu unu, ka ha ji ihe ndia jere ozi, bú ihe nke akọrọ unu ub͕u a site n'ọnu ndi ahu ndi zìri unu ozi ọma nka nime Mọ Nsọ eziputara n'elu-igwe; ihe ọ nāgu ndi-mọ-ozi inyocha ha.
13 N'ihi nka kenu ihe-ọkiké a n'úkwù nke uche-unu, nwe-kwa-nu anya-udo, lezu-kwa-nu anya okè n'amara nke anēwetara unu nime nkpughe nke Jisus Kraist;
14 dika umu nke iṅa-nti, unu eme-kwa-la onwe-unu ka unu di ka agu ihe ọjọ ahu si di, bú nke guru unu na mbu n'amaghi-ihe-unu: