14 ma-ọbu ndi-isi, dika ndi anēzite site n'aka-ya ka ha bọ̀ ọ́bọ̀ n'aru ndi nēme ihe ọjọ, ka ha to kwa ndi nēme ezi ihe.
15 N'ihi na otú a ka ọchichọ nke Chineke si di, ka unu site n'ime ezi ihe me ka amaghi-ihe nke ndi nēnweghi uche kpuchie ọnu:
16 dika ndi nwere onwe-ha, ma unu enweghi inwe-onwe-unu ahu dika ihe-nkpuchi nke ihe ọjọ, kama dika ndi-orù nke Chineke.
17 Sọpurunu madu nile. Hunu òtù ndi bu umu-nna n'anya. Nātunu egwu Chineke. Nāsọpurunu eze-unu.
18 Ndi nēje ozi, nēdonu onwe-unu n'okpuru ndi-nwe-unu n'egwu nile; ọ bughi nání n'okpuru ndi bu ezi madu ndi nwe-kwa-ra obi-ọma, kama ọ bu kwa n'okpuru ndi b͕agọrọ ab͕agọ.
19 N'ihi na nka bu ihe-ekele, ma ọ buru na onye ọ bula nātachi obi n'ihe-nwuta di iche iche n'ihi akọ-na-uche n'ebe Chineke nọ, nāhu ahuhu nke nēzighi ezi.
20 N'ihi na àha otuto gini di ya, ma ọ buru na, mb͕e unu nēmehie, mb͕e eti kwa unu aka, unu atachi obi na ya?