10 N'ihi na,Onye ahu nke nāchọ ihu ndu n'anya,Na ihu ezi ubọchi,Ya me ka ire-ya ghara ikwu ihe ọjọ,Me kwa ka eb͕ub͕ere-ọnu-ya ghara ikwu okwu aghughọ:
11 Ya si kwa n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya, me ezi ihe;Ya chọ udo, b͕aso kwa ya.
12 N'ihi na anya abua nke Onye-nwe-ayi di n'aru ndi ezi omume,Nti-Ya abua di kwa n'ebe aririọ-ha di:Ma iru nke Onye-nwe-ayi digidere ndi nēme ihe ọjọ.
13 Ọ̀nye bu kwa onye ahu nke gēmejọ unu, ma o buru na unu ghọro ndi nānu ọku n'obi n'iso ezi ihe?
14 Ma ọ buru kwa na unu ahu ahuhu n'ihi ezi omume, ngọzi nādiri unu: ma unu atula egwu ahu ha nākpata, obi alọ-kwa-la unu miri;
15 kama donu Kraist-ayi nsọ nime obi-unu dika Onye-nwe-unu: buru-kwa-nu ndi edoziworo mb͕e dum igọpuru onye ọ bula nke nāju unu ajuju bayere olile-anya ahu nke di nime unu, ma ka unu were nwayọ na egwu gọpu:
16 ebe unu nwere ezi akọ-na-uche; ka ewe me ka ihere me ha, bú ndi nākpali ibi-obi ọma unu nime Kraist, nime ihe ahu nke anēkwutọ unu nime ya.