2 n'ihi ndi-eze na ndi nile nọ n'ọnọdu di elu; ka ayi we biri obi udo na nke di nwayọ nime nsọpuru-Chineke nile na ikwesi-nsọpuru nile.
3 Nka di nma buru kwa ihe agānara nke-ọma n'iru Onye-nzọputa-ayi, bú Chineke;
4 Onye nāchọ ka azọputa madu nile, ka ha biaru kwa nmazu nke ezi-okwu.
5 N'ihi na otù Chineke di, otù Onye-ob͕ub͕o di kwa n'ab͕ata Chineke na madu, Onye Ya onwe-ya bu madu, bú Kraist Jisus,
6 Onye nyere Onwe-ya ka Ọ buru ihe-nb͕aputa n'ihi madu nile; nke agāb͕a àmà-ya n'oge nke aka ya;
7 nke edebere mu onwem ka m'buru onye-nkwusa na onye-ozi ka m'we b͕a àmà ahu (anamekwu ezi-okwu, ekwughm okwu-ugha), ibu kwa onye-ozizí nke ndi mba ọzọ nime okwukwe na ezi-okwu.
8 Ya mere ezuberem ka ndikom nēkpe ekpere n'ebe nile ọ bula, nāchili aka di ọcha elu, nēweghi iwe, nārughi kwa uka.