5 N'ihi na otù Chineke di, otù Onye-ob͕ub͕o di kwa n'ab͕ata Chineke na madu, Onye Ya onwe-ya bu madu, bú Kraist Jisus,
6 Onye nyere Onwe-ya ka Ọ buru ihe-nb͕aputa n'ihi madu nile; nke agāb͕a àmà-ya n'oge nke aka ya;
7 nke edebere mu onwem ka m'buru onye-nkwusa na onye-ozi ka m'we b͕a àmà ahu (anamekwu ezi-okwu, ekwughm okwu-ugha), ibu kwa onye-ozizí nke ndi mba ọzọ nime okwukwe na ezi-okwu.
8 Ya mere ezuberem ka ndikom nēkpe ekpere n'ebe nile ọ bula, nāchili aka di ọcha elu, nēweghi iwe, nārughi kwa uka.
9 Otú ahu, ezuberem ka ndinyom were ihe-ichọ-nma kwesiri ekwesi chọ onwe-ha nma, ya na nsọpuru na uche zuru okè; ọ bughi isi akpara akpa, na ọla-edo ma-ọbu pearl ma-ọbu uwe di oké ọnu-ahia;
10 kama (nke kwesiri ndinyom nēkwuputa egwu Chineke) ka ha site n'ezi ọlu chọ onwe-ha nma.
11 Ka nwanyi were nwayọ muta n'ido onwe-ya n'okpuru n'uzọ nile.