15 nke Ọ gēgosi n'oge nke aka Ya, Onye nání Ya bu Onye di ike, Onye bu kwa onye di ngọzi, bú Eze kachasi ndi bu eze, Onye bu kwa Onye-nwenu kachasi ndi nāchi ka ndi-nwe madu;
16 Onye nání Ya nwere anwughi-anwu, nēbi nime ìhè nke anāpughi ibiaru nso; Onye ọ dighi madu ọ bula huworo Ya anya, ma-ọbu pu ihu Ya anya: Onye nsọpuru na ike ebighi-ebi diri. Amen.
17 Nēnye ndi bu ọgaranya n'oge di ub͕u a iwu, ka ha ghara itukwasi uche-ha n'ihe di elu, ghara kwa itukwasi obi n'ihe ahu anējighi aka, bú àkù, kama ka ha tukwasi obi na Chineke, Onye nēwere àkù-Ya nye ayi ihe nile ka ha buru ihe gātọ ayi utọ;
18 ka ha nēme ezi ihe, ka ha buru ọgaranya n'ọlu ọma nile, ka ha buru ndi kwadebeworo ime ka ndi ọzọ keta ihe ha nwere, ka ha buru ndi kwere ka ndi ọzọ so ha nwekọ ihe;
19 ka ha kpadoro onwe-ha ntọ-ala ọma nye oge gaje ibia, ka ha we jide ndu ahu nke bu ndu n'ezie.
20 Biko Timọti, nēche ihe ahu enyere gi n'aka idebe, nēze okwu efu nile nke emeruru emeru nke ihe ahu anākpọ ihe-ọmuma n'uzọ ugha, ha na nguzogide-ya nile;
21 bú ihe-ọmuma nke ufọdu kwuputara we hie n'ihe bayere okwukwe-ayi.Ka amara diyere unu.