13 Ma ayi onwe-ayi agaghi-anya isi rue ihe anāpughi itù atù, kama dika ọtùtù nke ihe-ọtùtù ahu si di, bú nke Chineke keputara ayi, dika ọtùtù, ibiaru ọbuná n'ebe unu nọ.
14 N'ihi na ayi esetibigaghi onwe-ayi ókè, dika agāsi na ayi adighi-eru unu: n'ihi na ayi bu ndi buru uzọ biakute unu nime ozi ọma Kraist:
15 ayi adighi-anya isi rue ihe anāpughi itù atù, nke ahu bu, na ndọb͕u ndi ọzọ dọb͕uru onwe-ha n'ọlu; ma ayi nēle anya na, mb͕e okwukwe-unu nāba uba kari, agēme ka ayi di uku n'etiti unu dika ihe-ọtùtù-ayi si di rue ibabiga-ókè,
16 ka ayi we zisa ozi ọma rue ebe nile di n'ofè unu, ghara kwa inya isi bayere ihe edoziri ayi n'ihe-ọtùtù onye ọzọ.
17 Ma onye nānya isi, ya nya n'Onye-nwe-ayi.
18 N'ihi na onye ya onwe-ya nēme ka amara ya, ọ bughi onye ahu ka anwaputaworo, kama ọ bu onye Onye-nwe-ayi nēme ka amara ya.