11 N'ìhi gini? ọ̀ bu n'ihi na ahughi m unu n'anya? Chineke matara.
12 Ma ihe m'nēme ka m'gēme kwa, ka m'we bipuru ndi nāchọ ihe ha gēji megidem ihe ahu ha ji megidem; ha ewe hu na ha di kwa ka ayi onwe-ayi n'ihe ha nānya isi.
13 N'ihi na madu di otú a bu ndi-ozi ugha, ndi-ọlu nātu ntu, ndi nēme onwe-ha ka ha yie ndi-ozi Kraist.
14 Ọ bughi kwa ihe iju anya; n'ihi na Setan onwe-ya nēme onwe-ya ka o yie mọ-ozi nke ìhè.
15 Ya mere ọ bughi ihe uku ma asi na ndi nējere ya ozi nēme kwa onwe-ha ka ha yie ndi nēje ozi ezi omume; ndi ọgwugwu-ha gādi ka ọlu-ha si di.
16 Asim ọzọ, Ka madu ọ bula ghara ichè na abum onye nēnweghi uche: ma ọ buru na unu emeghi otú a, otú ọ di naranum nke-ọma dika onye nēnweghi uche, ka mu onwem we nya kwa isi nke-ntà.
17 Ihe m'nēkwu, ekwughi m dika Onye-nwe-ayi gēkwu, kama ọ bu dika n'enweghi-uche, n'ihe m'dabere we nānya isi.