7 ya mere, kama ibara ya nba ọzọ anamachọ ka unu were amara b͕aghara ya kasi kwa ya obi, ka aghara iji ihe-nwuta nke nēwutabiga ya ókè loda madu di otú a n'uzọ ọ bula.
8 N'ihi nka ariọm unu ka unu me ka ihu-n'anya unu huru ya buru ihe di itukwasi obi.
9 N'ihi na ihe mere m'degara unu akwukwọ bu kwa nka, ka m'we mara nnwaputa unu, ma unu bu ndi nāṅa nti rue ihe nile.
10 Ma onye ọ bula unu were amara b͕aghara ya ihe ọ bula, mu onwem were kwa amara b͕aghara ya: n'ihi na ihe mu onwem werewo-kwa-ra amara b͕aghara, ma ọ buru na ewerewom amara b͕aghara ihe ọ bula, ọ bu n'ihi unu ka m'meworo ya n'iru Kraist;
11 ka Setan we ghara irib͕u ayi: n'ihi na ayi abughi ndi nāmaghi ihe nile ọ nēchèputa.
12 Ma mb͕e m'biaruru Troas izisa ozi ọma Kraist, mb͕e emeghereri kwa ọnu-uzọ nime Onye-nwe-ayi nyem,
13 mọm adighi nfé ma-ọli, n'ihi na ahughi m Taitọs nwa-nnam: kama ekelerem ha ekele ikpe-azu, we pua je Masedọnia.