9 N'ihi na ihe mere m'degara unu akwukwọ bu kwa nka, ka m'we mara nnwaputa unu, ma unu bu ndi nāṅa nti rue ihe nile.
10 Ma onye ọ bula unu were amara b͕aghara ya ihe ọ bula, mu onwem were kwa amara b͕aghara ya: n'ihi na ihe mu onwem werewo-kwa-ra amara b͕aghara, ma ọ buru na ewerewom amara b͕aghara ihe ọ bula, ọ bu n'ihi unu ka m'meworo ya n'iru Kraist;
11 ka Setan we ghara irib͕u ayi: n'ihi na ayi abughi ndi nāmaghi ihe nile ọ nēchèputa.
12 Ma mb͕e m'biaruru Troas izisa ozi ọma Kraist, mb͕e emeghereri kwa ọnu-uzọ nime Onye-nwe-ayi nyem,
13 mọm adighi nfé ma-ọli, n'ihi na ahughi m Taitọs nwa-nnam: kama ekelerem ha ekele ikpe-azu, we pua je Masedọnia.
14 Ma ekele diri Chineke, Onye nēdughari ayi n'ọṅù-agha nime Kraist mb͕e nile, nēsite kwa n'aka-ayi egosi isìsì nke ọmuma-Ya n'ebe nile.
15 N'ihi na ayi bu isìsì utọ nke Kraist n'ebe Chineke nọ, n'etiti ndi anāzọputa, na n'etiti ndi nāla n'iyì;