1 N'ihi na ayi matara na asi na akwaturu ulo nke uwa, bú ulo-ikwū-ayi, ayi nwere ulo ewuru nke sitere na Chineke, ulo anējighi aka wu, di ebighi-ebi, n'elu-igwe.
2 N'ihi na ayi nāsu udè nime ulo nka ezie, ebe ọ nāgusi ayi ike ka ewere ebe-obibi-ayi nke sitere n'elu-igwe yikwasi ayi n'elu ya:
3 ebe ọ bu na agāhu ayi ndi eyiworo ihe, ndi nāb͕aghi ọtọ.
4 N'ihi na ayi, bú ndi nọ n'ulo-ikwū a, ayi nāsu udè ezie, ebe ọ nānyib͕u ayi; n'ihi na ayi achọghi ka eyipu ayi ya, kama ka eyikwasi ayi ihe n'elu ya, ka ndu we loda ihe puru inwu anwu.
5 Ma Onye luputara ayi ka ewe me otù ihe a bu Chineke, Onye nyere ayi Mọ Nsọ, bú ihe ayi ji mara na agēmezuru ayi ya.