4 N'ihi na ayi, bú ndi nọ n'ulo-ikwū a, ayi nāsu udè ezie, ebe ọ nānyib͕u ayi; n'ihi na ayi achọghi ka eyipu ayi ya, kama ka eyikwasi ayi ihe n'elu ya, ka ndu we loda ihe puru inwu anwu.
5 Ma Onye luputara ayi ka ewe me otù ihe a bu Chineke, Onye nyere ayi Mọ Nsọ, bú ihe ayi ji mara na agēmezuru ayi ya.
6 Ya mere ayi nēnwe obi-ike mb͕e nile, mata kwa na mb͕e ayi nọ n'ulo n'aru-ayi, ayi anọghi n'ulo n'ebe Onye-nwe-ayi nọ:
7 (n'ihi na ayi sitere n'okwukwe nējeghari, ọ bughi n'ọhuhu-uzọ);
8 ayi nēnwe obi-ike, ka m'kwuru, ọ di kwa ayi ezi nma kari ka ayi ghara inọ n'ulo n'aru-ayi, ka ayi nọ kwa n'ulo n'ebe Onye-nwe-ayi nọ.
9 N'ihi nka ayi nējisi kwa ike ka ayi we buru ndi di Ya ezi utọ, ma ayi nọ n'ulo ma-ọbu na ayi anọghi n'ulo.
10 N'ihi na aghaghi ime ka ayi nile puta ìhè n'iru oche-ikpé Kraist; ka ayi nile n'otù n'otù we nāghachi íhe esitere n'aru me, dika ihe onye ọ bula mere si di, ma ọ bu ezi ihe ma-ọbu ihe nādighi nma.