1 Ya mere ndi m'huru n'anya, ebe ayi nwere nkwa ndia, ka ayi sachapu n'onwe-ayi nmeru nile nke aru na nke mọ, nēmezu idi-nsọ n'egwu Chineke.
2 Nyenu ayi uzọ n'obi-unu; ayi emeghi onye ọ bula ajọ omume, ayi emebighi onye ọ bula, ayi erib͕ughi onye ọ bula.
3 Ọ bughi ima unu ikpé ka m'nēkwu ya: n'ihi na ekwuwom ya na mbu, na unu di ayi n'obi inwukọ ọnwu na idikọ ndu.
4 Nkwuwa-okwum di uku, bú nke m'ji agwa unu okwu, inya-isim n'ihi unu di uku: nkasi-obi ezuwo ezu nimem, anamaṅuribiga ókè kari na nkpab͕u-ayi nile.
5 N'ihi na mb͕e ayi bia-kwa-ra na Masedọnia, anu-aru-ayi adighi nfé ma-ọli, kama anākpab͕u ayi n'akuku nile; ilu-ọ̀gù di n'èzí, egwu di nime.