16 Ma ekele diri Chineke, Onye nētiye otù inu-ọku ahu n'ihi unu n'obi Taitọs.
17 N'ihi na ọ nara aririọ-ayi nke-ọma n'ezie; ma ebe ọ nānu ọku n'obi kari ihe m'chère, o siri n'ebe a pua jekuru unu dika o zuputara n'onwe-ya.
18 Ayi ezìkọwo kwa ya na nwa-nna-ayi ahu onye otuto-ya n'ozi ọma ayi ruzuru nzukọ Kraist nile;
19 ma ọ bughi nání otú a, kama nzukọ Kraist nile rọputa-kwa-ra ya ka ọ nēso ayi n'ije ije n'amara nka, nke ayi nēje ozi ya inye Onye-nwe-ayi otuto, na igosi obi di ọku nke ayi:
20 ma ayi nēze nka, ka onye ọ bula ghara ita ayi uta n'oké onyinye-amara nka nke ayi nēje ozi ya:
21 n'ihi na ayi buru uzọ nēchè ihe ọma, ọ bughi nání n'iru Onye-nwe-ayi, kama n'iru madu kwa.
22 Ayi ezìkọwo kwa ha na nwa-nna-ayi, onye ayi nwaputara ọtutu mb͕e na ọ nānu ọku n'obi n'ọtutu ihe, ma ub͕u a ọ nānu kari ọku n'obi nke-uku, site n'oké ntukwasi-obi nke ọ nātukwasi n'aru unu.