20 ma ayi nēze nka, ka onye ọ bula ghara ita ayi uta n'oké onyinye-amara nka nke ayi nēje ozi ya:
21 n'ihi na ayi buru uzọ nēchè ihe ọma, ọ bughi nání n'iru Onye-nwe-ayi, kama n'iru madu kwa.
22 Ayi ezìkọwo kwa ha na nwa-nna-ayi, onye ayi nwaputara ọtutu mb͕e na ọ nānu ọku n'obi n'ọtutu ihe, ma ub͕u a ọ nānu kari ọku n'obi nke-uku, site n'oké ntukwasi-obi nke ọ nātukwasi n'aru unu.
23 Ma ọ buru na onye ọ bula aju ajuju bayere Taitọs, ọ bu onye mu na ya nēnwekọ ihe, buru kwa onye mu na ya nālukọrọ unu ọlu; ma-ọbu umu-nna-ayi, ha bu ndi-ozi nke nzukọ Kraist, ha bu otuto nke Kraist.
24 Ya mere nēgosinu ha n'iru nzukọ Kraist nile ihe gēgosi ihu-n'anya-unu na inya-isi-ayi bayere unu.