5 Ya mere agurughi m na ọ di nkpà iriọ umu-nna-ayi, ka ha buru uzọ jekuru unu, buru kwa uzọ me ka ihe-ngọzi ahu nke unu buru uzọ kwe na nkwa zu okè, ka ihe ahu we buru ihe edoziri, dika ihe-ngọzi, ọ bughi kwa dika ihe-nrib͕u.
6 Ma nka ka m'kwuru, Onye were aka-ntagide nāgha nkpuru gēwere kwa aka-ntagide nēwe ihe-ubi; onye were kwa ngọzi nāgha nkpuru gēwere kwa ngọzi nēwe ihe-ubi.
7 Ka onye ọ bula n'etiti unu nye dika o buru uzọ rọputa n'obi-ya; ọ bughi site na nwuta, ma-ọbu site na nkpà: n'ihi na Chineke huru onye were obi-utọ nēnye n'anya.
8 Ma Chineke puru ime ka amara nile babigara unu ókè; ka unu we babiga ókè ilu ezi ọlu nile ọ bula, ebe unu nwezuru ihe nile nākpa unu n'uzọ ọ bula mb͕e nile:
9 dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si,Ọ ghasara àkù-ya, o nyere ndi-ob͕eye ihe;Ezi omume-ya nānọgide rue mb͕e ebighi-ebi.
10 Ma Onye ahu Nke nwere inyezu onye nāgha nkpuru nkpuru-ya, Onye nwe-kwa-ra inyezu madu nri ka o rie, Onye ahu gēnyezu unu nkpuru-ọghigha-unu, me kwa ka ha ba uba, Ọ gēme kwa ka nkpuru ezi omume-unu rie nne kari:
11 ebe anēme ka unu buru ọgaranya n'ihe nile ọ bula rue afọ-ofufo nile, nke sitere n'aka-ayi nāluputa ekele anēkele Chineke.