18 olu a ka ayi onwe-ayi nukwara ka o nēsi n'elu-igwe da, mb͕e ayi na Ya nọ n'ugwu ahu di nsọ.
19 Eme-kwa-ra ka okwu amuma ahu guzosiere ayi ike kari; nke unu nēme nke-ọma n'iṅa nti ya, dika oriọna mb͕e ọ nēnwu n'ebe b͕ara ọchichiri, rue mb͕e chi gābọ, kpakpando chi-ọbubọ we tibe n'obi-unu:
20 ebe unu buru uzọ mara nka, na ọ dighi amuma ọ bula n'ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nke madu puru ikọ isi-ya site na nání uche nke aka ya.
21 N'ihi na ọ dighi amuma ọ bula nke eji ọchichọ madu bu mb͕e ọ bula: kama madu sitere na Chineke kwue okwu, mb͕e Mọ Nsọ nēme ka ha kwue.