14 kama anānwa onye ọ bula mb͕e agu ihe ọjọ nke aka ya nādọkpufu ya, ewe rafue ya.
15 Mb͕e ahu agua ihe ọjọ ahu, mb͕e ọ tuworo ime, o we muputa nmehie: nmehie ahu, mb͕e o tozuru okè, o we muputa ọnwu.
16 Unu ekwela ka eduhie unu, umu-nnam ndi m'huru n'anya.
17 Ezi onyinye ọ bula na ihe ọ bula zuru okè nke enyere enye si n'elu bia, ebe o si n'aka Nna nke ìhè ridata, Onye ọghugha ọ bula nāpughi idi n'ebe Ọ nọ, ma-ọbu onyinyo nke nchighari nēweta.
18 N'ihi na O zubere ya O were okwu nke ezi-okwu muputa ayi, ka ayi we buru otù aha nkpurú mbu nke ihe O kère èkè.
19 Unu matara nka, umu-nnam ndi m'huru n'anya. Ma ka madu ọ bula buru onye nānu ihe ọsọsọ, onye nādighi ngwa ikwu okwu, nādighi kwa ngwa iwe iwe:
20 n'ihi na iwe madu adighi-alu ọlu ezi omume Chineke.