22 I huwo na okwukwe-ya soro ọlu-ya lukọ ọlu, esite-kwa-ra n'ọlu ahu me ka okwukwe ahu zue okè;
23 ewe mezu ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nke nāsi, Abraham we kwere okwu Chineke, ewe gua ya nye ya n'ezi omume; ewe kpọ ya eyì nke Chineke.
24 Unu ahuwo na anēsite n'ọlu gu madu n'onye ezi omume, adighi-esite kwa nání n'okwukwe.
25 Ma n'uzọ di otù a èsiteghi kwa n'ọlu gu Rehab, bú nwanyi nākwa iko, n'onye ezi omume, mb͕e ọ kpọbatara ndi-ozi ahu, we zipu ha n'uzọ di iche?
26 N'ihi na dika aru bu ihe nwuru anwu ma mọ adighi ya, ọbuná otú a okwukwe bu ihe nwuru anwu ma ọlu adighi ya.