5 Unu biri n'oké oriri na ọṅuṅu n'elu uwa, di kwa ndu ọjọ dika ọ nātọ aru-unu utọ; unu zùru obi-unu n'ubọchi ob͕ub͕u.
6 Unu mara ikpé, unu b͕uru onye ezi omume ahu; ọ dighi-edo onwe-ya imegide unu.
7 Ya mere, umu-nnam, nātachinu ogologo-ntachi-obi rue ọbibia nke Onye-nwe-ayi. Le, onye-ọlu-ubi nēche nkpuru di oké ọnu-ahia nke ala, nātachi ogologo-ntachi-obi n'ebe ọ di, rue mb͕e ọ gānata miri-ozuzo mbu na miri-ozuzo ikpe-azu.
8 Unu onwe-unu, nātachi-kwa-nu ogologo-ntachi-obi; menu ka obi-unu guzosie ike: n'ihi na ọbibia nke Onye-nwe-ayi di nso.
9 Umu-nnam, unu atamuritala megide onwe-unu, ka ewe ghara ikpe unu: le, Onye-ikpé-ayi nēguzo n'iru ọnu-uzọ.
10 Umu-nnam, natanu ndi-amuma ahu, bú ndi kwuru okwu n'aha Onye-nwe-ayi, dika ihe-ilere-anya nke ihuju-anya na nke ogologo-ntachi-obi.
11 Le, ayi nākpọ ha ndi ngọzi diri, bú ndi tachiri obi: unu nuru ihe bayere ntachi-obi nke Job, hu kwa ihe Onye-nwe-ayi zubere, na Onye-nwe-ayi bu onye nwere ọmiko ri nne, nwe kwa obi ebere.