33 Mu onwem amaghi kwa Ya: ma Onye ziterem ka m'were miri me baptism, Onye ahu sirim, Onye ọ bula i gāhu Mọ Nsọ ka Ọ nēfedakwasi Ya, nānọgide kwa n'aru Ya, Onye ahu bu Onye nēji Mọ Nsọ eme baptism.
34 Mu onwem ahuwo kwa, b͕a kwa àmà na Onye a bu Ọkpara Chineke.
35 Ọzọ n'echi-ya Jọn guzoro, ya na madu abua nime ndi nēso uzọ-ya;
36 o we le Jisus anya ka Ọ nējeghari, ọ si, Le, Nwa-aturu Chineke!
37 Madu abua ahu ndi nēso uzọ-ya we nu ka ọ nēkwu, ha we so Jisus.
38 Jisus we chigharia, kiri ha ka ha nēso Ya, Ọ si ha, Gini ka unu nāchọ? Ha we si Ya, Rabai (nke isi-ya bu, ma asugharia ya, Onye-ozizí), òle ebe I bi?
39 Ọ si ha, Bianu, unu gāhu kwa. Ya mere ha biara hu ebe O biri; ha na Ya we nọgide ubọchi ahu; ọ di ka oge hour nke-iri.