22 Ma ememe icheta owuwu ulo uku Chineke ọhu ruru na Jerusalem: ọ bu mb͕e oyi;
23 Jisus we nējeghari n'ulo uku Chineke n'ìbà Solomon.
24 Ya mere ndi-Ju nọgidere Ya buruburu, we si Ya, Ì nākwuba nkpuru-obi-ayi n'elu rue ole mb͕e? Ọ buru na Gi onwe-gi bu Kraist-ayi, gwawa ayi.
25 Jisus zara ha, si, Agwaram unu, ma unu adighi-ekwe: ọlu nke Mu onwem nālu n'aha Nnam, ndia nāb͕aram àmà.
26 Ma unu onwe-unu adighi-ekwe, n'ihi na unu adighi nime aturu nkem.
27 Aturu nkem nānu olum, Mu onwem ma-kwa-ra ha, ha nēsokwam:
28 Mu onwem nēnye kwa ha ndu ebighi-ebi; ha agaghi-ala kwa n'iyì ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi, ọ dighi kwa onye ọ bula gānapu ha n'akam.