28 Mu onwem nēnye kwa ha ndu ebighi-ebi; ha agaghi-ala kwa n'iyì ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi, ọ dighi kwa onye ọ bula gānapu ha n'akam.
29 Nnam, Nke nyeworom ha, bu Onye uku kachasi ihe nile; ọ dighi kwa onye ọ bula puru inapu ihe n'aka Nnam.
30 Mu onwem na Nnam bu otù.
31 Ndi-Ju tuturu nkume ọzọ ka ha tua Ya.
32 Jisus zara ha, si Ọtutu ọlu ọma ka M'gosiri unu site na Nnam; n'ìhi aha ọlu gini nime ndia Ka unu nātum nkume?
33 Ndi-Ju zara Ya, si, Ọ bughi n'ihi ọlu ọma ka ayi nātu Gi nkume, kama ọ bu n'ihi nkwulu; n'ihi kwa na Gi onwe-gi, ebe I bu madu, I nēme Onwe-gi Chineke.
34 Jisus zara ha, si, Èdeghi ya n'iwu-unu, si, Mu onwem siri, Chi ka unu bu?