12 Ya mere ndi nēso uzọ-Ya siri Ya, Onye-nwe-ayi, ọ buru na ọ dawo n'ura, agāzọputa ya.
13 Ma Jisus kwururi okwu bayere ọnwu-ya: ma ndi ahu chère na Ọ nēkwu okwu bayere ida n'ura efu.
14 Ya mere Jisus gwawara ha okwu mb͕e ahu, si, Lazarọs nwuru anwu.
15 Anamaṅuri kwa ọṅu n'ihi unu na adighi m n'ebe ahu, ka unu we kwere; otú ọ di, ka ayi jekuru ya.
16 Ya mere Tomas, onye anākpọ Didimọs, siri ibe-ya ndi nēso Jisus, Ka ayi onwe-ayi je kwa, ka ayi we so Ya nwua.
17 Ya mere mb͕e Jisus biara, Ọ huru na ọ diwori n'ílì ubọchi anọ a.
18 Ma Betani di Jerusalem nso, ihe dika furlong iri na ise n'idi-anya;