52 ọ bughi kwa nání n'ọnọdu mba ahu, kama ka O we me kwa ka umu Chineke ndi b͕asaworo zukọ n'otù.
53 Ya mere site n'ubọchi ahu ha b͕ara ìzù ka ha we b͕ue Ya.
54 Ya mere Jisus adighi-ejeghari n'iru ọra madu n'etiti ndi-Ju ọzọ, kama O si n'ebe ahu je ba n'ala nke di ọhia nso, ba n'obodo anākpọ Ifraim; O we nọgide n'ebe ahu, Ya na ndi nēso uzọ-Ya.
55 Ma ememe ngabiga nke ndi-Ju di nso: ọtutu madu we si n'ala ndi-Ju rigoro Jerusalem mb͕e ememe ngabiga ahu akērughi, ime onwe-ha ka ha di ọcha.
56 Ya mere ha nāchọ Jisus, we nēkwurita n'etiti onwe-ha, mb͕e ha guzoro n'ulo uku Chineke, si, Gini ka unu nēchè? Nà Ọ gaghi-abia n'ememe a ma-ọli?
57 Ma ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi nyereri iwu ka, ọ buru na onye ọ bula mara ebe Ọ nọ, ka o gosi ya, ha we jide Ya.