30 Jisus zara, si, Ọ bughi n'ihim ka olu a daworo, kama ọ bu n'ihi unu.
31 Ub͕u a ka ikpé uwa nka di: ub͕u a ka agāchupu onye-isi uwa nka.
32 Mu onwem, ọ buru na eweliem elu site n'ala, M'gādọrọ kwa madu nile nye onwem.
33 Ma nka ka O kwuru, nēgosi aha ọnwu Ọ gaje inwu.
34 Ya mere ìgwè madu ahu zara Ya, si, Ayi onwe-ayi nuru site n'iwu-ayi na Kraist-ayi nānọgide rue mb͕e ebighi-ebi: Gì onwe-gi si kwa aṅa si, Aghaghi iweli Nwa nke madu elu? Ònye bu Nwa nke madu a?
35 Ya mere Jisus siri ha, Nwa oge fọduru ka Ìhè ahu gādi n'etiti unu. Nējegharinu mb͕e unu nēnwe Ìhè ahu, ka ọchichiri ghara ijide unu: onye nējeghari n'ọchichiri adighi-amata ebe ọ nēje.
36 Mb͕e unu nēnwe Ìhè ahu, kwerenu n'Ìhè ahu, ka unu we ghọ umu Ìhè.Ihe ndia ka Jisus kwuru, O we je zonari ha Onwe-ya.