1 Ma mb͕e ememe ngabiga akērughi, ebe Jisus matara na oge hour Ya abiawo ka O si n'uwa nka lakuru Nna-Ya, ebe Ọ huru ndi nke aka Ya nọ n'uwa n'anya, Ọ huru ha n'anya rue ogwugwu ihe nile.
2 Mb͕e ha nēri nri-anyasi, mb͕e ekwensu tinyesiri ub͕u a n'obi Judas Iskariot, nwa Saimon, ka ọ rara Ya nye,
3 Jisus, ebe Ọ matara na nna-Ya nyere Ya-ri ihe nile n'aka, na O si-kwa-ra n'ebe Chineke nọ puta, nālakuru kwa Chineke,
4 O bilie na nri-anyasi, wusa uwe-Ya, we chiri ákwà anēji hicha aru, we ke Onwe-ya n'úkwù.