3 Ọ buru kwa na Mu aga idoziri unu ebe, agajem ibia ọzọ, M'gānara kwa unu nye Onwem; ka unu onwe-unu we nọ kwa ebe Mu onwem nọ.
4 Ebe Mu onwem nāla, unu mata-kwa-ra uzọ-ya.
5 Tomas si Ya, Onye-nwe-ayi, ayi amataghi ebe I nāla; àyi si aṅa mata uzọ-ya?
6 Jisus si ya, Mu onwem bu uzọ, na ezi-okwu, na ndu: ọ dighi onye ọ bula nābiakute Nnam, ma-ọbughi site na Mu.
7 Ọ buru na unu maramri, unu gāmatawo-kwa-ri Nnam: site n'ub͕u a unu mara Ya, unu ahuwo kwa Ya.
8 Filip si Ya, Onye-nwe-ayi, gosi ayi Nna ahu, ọ gēzu-kwa-ra ayi.
9 Jisus si ya, Ogologo oge di otú a ka Mu na gi nọ, ma ì mataghm, Filip? onye huworom anya ahuwo Nnam anya; gì onwe-gi si aṅa si, Gosi ayi Nnam ahu?